11. Onye Livai we kwere ibiri n'ulo nwoke; nwa-okorọbia ahu we di ya ka otù nime umu-ya ndikom.
12. Maika we mejue aka onye Livai ahu, nwa-okorọbia ahu we ghọrọ ya onye-nchu-àjà, nọ n'ulo Maika.
13. Maika we si, Ub͕u a ka m'mara na Jehova gēmem nma, n'ihi na onye Livai burum onye-nchu-àjà.