Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 17:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma otù nwoke nke ugwu Efraim di, aha-ya bu Maika.

2. Ọ si nne-ya, Nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri-na-ise ahu i nwere nke ewere ewere, nke gi onwe-gi b͕ara iyi bayere ya, i we kwu kwa ya na ntim, le, ọla-ọcha ahu di n'akam; mu onwem were ya. Nne-ya we si, Onye agọziri agọzi diri Jehova ka nwam bu.

3. Ọ we nyeghachi nne-ya nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri-na-ise ahu, nne-ya we si, Edoworom Jehova ọla-ọcha ahu nsọ n'ezie site n'akam inye nwam, ime arusi apiri api na arusi awuru awu: ma ub͕u a m'gēnyeghachi gi ya.

4. Ọ we nyeghachi nne-ya ọla-ọcha ahu, nne-ya we chiri ọgu ego ọla-ọcha iri, nye onye-nnucha-ọla, o we me ya arusi apiri api na arusi awuru awu: o we di n'ulo Maika.

5. Nwoke ahu, bú Maika, we nwe ulo Chineke, o we me ephod na teraphim, mejue aka nke otù nime umu-ya ndikom, o we ghọrọ ya onye-nchu-àjà.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 17