Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 16:14-27 Bible Nso (IGBOB)

14. O we were ǹtú ya, si ya, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. O we teta n'ura-ya, were ǹtú nke ihe eji akpà ákwà na ákwà ahu akpara, bulie ije-ya.

15. Delaila we si ya, Ì si aṅa si, Ahurum i n'anya, ma obi-gi adighi n'ebe m'nọ? ub͕ò atọ a ka i kwaworom emò, ma i gosighm ihe ọ bu, bú nke ike uku gi di nime ya.

16. O rue, mb͕e o were okwu-ya nile kpagide ya ubọchi nile, sob͕u kwa ya, na nkpuru-obi-ya enweghi ntachi-obi rue ọnwu.

17. O we gosi ya obi-ya nile, si ya, Ọ dighi mb͕e aguba gara n'elu isim; n'ihi na onye-Nazirait nke Chineke ka m'bu site n'afọ nnem: ọ buru na akọpum isi, ikem gēsi n'arum wezuga onwe-ya, m'gābu kwa onye nādighi ike, di kwa ka madu nile si di.

18. Delaila we hu na o gosiri ya obi-ya nile, o we ziga kpọ ndi-isi ndi Filistia, si, Rigotanu otù ub͕ò a, n'ihi na o gosiwom obi-ya nile. Ndi-isi ndi Filistia we rigokute ya, chigota ego ahu n'aka-ha.

19. O we me ka Samson raru ura n'ikperè-ukwu-ya abua; o we malite iweda ya n'ala, ike-ya we si n'aru ya wezuga onwe-ya.

20. O we si, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. O we teta n'ura-ya, si, M'gāpu dika m'nēme ub͕ò ub͕ò, we meghari aru. Ma ya onwe-ya amaghi na Jehova esiwo n'ebe ọ nọ wezuga Onwe-ya.

21. Ndi Filistia we jide ya, rukpọ anya-ya abua; ha we me ka ọ ridarue Geza, were ihe ọla abua ke ya ab͕u; o we buru onye nēgwe ọka n'ulo ndi ekere ab͕u.

22. Agiri-isi-ya we malite irute mb͕e akọpusiri ya.

23. Ndi-isi ndi Filistia we chikọta onwe-ha ichuru Degon, bú chi-ha, àjà uku, na iṅuri ọṅu: ha si, Chi-ayi enyewo Samson, bú onye-iro-ayi, n'aka-ayi.

24. Ndi ahu we hu ya, to chi-ha: n'ihi na ha siri, Chi-ayi enyewo onye-iro-ayi n'aka-ayi, bú onye nēme ka ala-ayi tọb͕ọrọ n'efu, onye me-kwa-ra ka ndi-ayi eb͕uru eb͕u ba uba.

25. O rue, mb͕e obi-ha di nma, na ha siri, Kpọnu Samson, ka ọ we mere ayi ihe-ọchì. Ha we si n'ulo ndi ekere ab͕u kpọputa Samson; o we me ihe-ọchì n'iru ha: ha we me ka o guzo n'etiti ogidi.

26. Samson we si nwa-okoro onye nēji ya n'aka, Ka m'nọduru onwem, ka m'we metu ogidi nke ulo nēguzosi ike n'elu ha aka, ka m'we dabere ha.

27. Ma ulo ahu juputara na ndikom na ndinyom; n'ebe ahu ka ndi-isi nile nke ndi Filistia nọ kwa; ihe ra ka nnù ndikom na ndinyom asa na ọgu iri nọ kwa n'elu ulo, ndi nēle ka Samson nēme ihe-ọchì.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 16