Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 16:1-3 Bible Nso (IGBOB)

1. Samson we jerue Geza, hu otù nwayi nākwa iko n'ebe ahu, o we bakuru ya.

2. Ewe gwa ndi Geza, si, Samson abiawo ebe a. Ha we b͕a ya buruburu, che ya anwu abali ahu nile n'ọnu-uzọ-ama obodo, nọdu du abali ahu nile, si, Ka ọ di rue ìhè ututu, ayi we b͕ue ya.

3. Samson we dina rue etiti abali, bilie n'etiti abali, jide ibo ọnu-uzọ-ama obodo, jide kwa ide-ya abua, ropu ha, tiyere nkpọrọ, tukwasi ha n'ubu-ya abua, būru ha rigo n'elu ugwu nke di n'iru Hebron.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 16