Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 13:6-20 Bible Nso (IGBOB)

6. Nwayi ahu we bia, gwa di-ya, si, Onye nke Chineke biakuterem, n'ile ya anya ọ di kwa ka mọ-ozi nke Chineke n'ile ya anya, ọ di itu egwu nke-uku; ma ajughm ya ebe o si bia, o gosighkwam aha-ya:

7. o we sim, Le, i gaje itu ime, mua nwa-nwoke; ma ub͕u a aṅula manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, eri-kwa-la ihe ọ bula ruru árú: n'ihi na onye-Nazirait nke Chineke ka nwata ahu gābu site n'afọ rue ubọchi ọnwu-ya.

8. Manoa we riọ Jehova aririọ, si, Biko, Onye-nwe-ayi, ka onye nke Chineke ahu nke I zitere biaghachikute ayi ọzọ, ariọm I, ka o zí kwa ayi ihe ayi gēme nwata ahu nke agāmu.

9. Chineke we ge nti olu Manoa; mọ-ozi nke Chineke we biakute nwayi ahu ọzọ ka ya onwe-ya nānọdu n'ubi: ma Manoa, bú di-ya, anọyeghi ya.

10. Nwayi ahu we me ngwa, b͕a ọsọ, gosi di-ya, si ya, Le, nwoke ahu nke biakuterem ubọchi a emewo ka m'hu ya anya ọzọ.

11. Manoa we bilie, jeso nwunye-ya, biakute nwoke ahu, si ya, Gi onwe-gi, ì bu nwoke ahu nke gwara nwayi a okwu? O we si, Mu ka ọ bu.

12. Manoa we si, Ub͕u a ka okwu-gi nile rè: gini gābu ikpé bayere nwata ahu, gini gābu kwa omume-ya?

13. Mọ-ozi nke Jehova we si Manoa, N'ihe nile nke m'siri nwayi a ya lezie anya.

14. Ọ gaghi-eri ihe sitere n'ihe ọ bula nke nēsi n'osisi vine nke manya-vine puta, ya aṅu-kwa-la manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, ya eri-kwa-la ihe ọ bula ruru árú; ihe nile nke m'nyere ya n'iwu ka ọ gēdebe.

15. Manoa we si mọ-ozi nke Jehova, Biko, kwe ka ayi b͕ochie gi, ka ayi we dozie nwa-ewu n'iru gi.

16. Mọ-ozi nke Jehova we si Manoa, Ọ buru na i b͕ochiem, m'gaghi-eri nime nri-gi: ọ buru kwa na i me àjà-nsure-ọku, ọ bu Jehova ka i gēsurere ya. N'ihi na Manoa amaghi na mọ-ozi nke Jehova ka ọ bu.

17. Manoa we si mọ-ozi nke Jehova, Gini bu aha-gi, ka ayi we sọpuru gi mb͕e okwu-gi nile gēre?

18. Mọ-ozi nke Jehova we si ya, N'ìhi gini kwa ka i nāju ajuju bayere aham, ebe aha ahu di ebube?

19. Manoa we were nwa-ewu ahu na onyinye-inata-iru-ọma, surere ya Jehova ọku n'elu oké nkume: mọ-ozi nālu kwa oké ọlu, ma Manoa na nwunye-ya nēle ya anya.

20. O rue, mb͕e ire-ọku nēsi n'ebe-ichu-àjà ahu rigo n'elu-igwe, na mọ-ozi nke Jehova rigoro nime ire-ọku nke ebe-ichu-àjà ahu: Manoa na nwunye-ya nēle kwa ya anya; ha we da kpue iru-ha n'ala.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 13