Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Malakai 3:2-6 Bible Nso (IGBOB)

2. Ma ònye gānagide ubọchi ọbibia-Ya? ọ̀ bu kwa onye ganēguzogide mḅe anāhu Ya anya? n'ihi na Ya onwe-ya di ka ọku onye-nnucha-ihe na dika nchà nke ọsu-ákwà:

3. Ọ gānọdu kwa ala dika onye-nnucha ọla-ọcha nke nēme ka ọ di ọcha, Ọ gēme kwa ka umu Livai di ọcha, sicha kwa ha dika ọla-edo na ọla-ọcha; ha ganēweta nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma n'ezi omume.

4. Onyinye-inata-iru-ọma nke Juda na Jerusalem gātọ kwa Jehova utọ, dika n'ubọchi mḅe ebighi-ebi gara aga, na dika n'arọ nile gara aga.

5. M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

6. N'ihi na Mu onwem, bú Jehova, aḅanweghi; ya bu na emeghi ka unu onwe-unu gwusia, umu Jekob.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Malakai 3