Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Malakai 1:6-12 Bible Nso (IGBOB)

6. Nwa nāsọpuru nna-ya, orù nāsọpuru kwa onye-nwe-ya: ọ buru kwa na nna ka M'bu, òle ebe nsọpurum di? ọ buru kwa na onye-nwe-madu ka M'bu, òle ebe egwum di? ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri unu, unu ndi-nchu-àjà, ndi nēlelì aham. Ma unu asiwo, Nìme gini ka ayi lelìworo aha-Gi?

7. Unu nēweta nso achicha emere ka ọ ghara idi nsọ n'elu ebe-ichu-àjàm. Ma unu nāsi, Nìme Gini ka ayi meworo Gi ka I ghara idi nsọ? N'isi, Table nke Jehova, ihe nlelì ka ọ bu.

8. Ọzọ, mḅe unu nēweta anu kpuru ìsì nso, ihe ọjọ adighi ya! mḅe unu nēweta nso nke gwọrọ ngwurọ na nke nāria ọria, ihe ọjọ adighi ya! Biko, weta ya nso onye nāchi ala-gi; ìhe-gi gātọ ya utọ? ma-ọbu ọ̀ gāhu gi iru-ọma? otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

9. Ma uḅu a, biko, menu ka iru Chineke dajua, ka O we mere ayi amara: ọ bu site n'aka-unu ka nka diworo: Ọ̀ gāhu onye ọ bula nime unu iru-ọma? ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri:

10. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na otù onye di n'etiti unu nke nēmechi uzọ, ka unu we ghara ifunwu ọku nke ebe-ichu-àjàm n'efu! ọ dighi ihe-unu nātọm utọ, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, M'gaghi-anara kwa onyinye-inata-iru-ọma n'aka-unu nke-ọma.

11. N'ihi na site n'ọwuwa anyanwu we rue ọdida-ya aham di uku n'etiti mba nile; ọ bu kwa n'ebe nile ọ bula ka anēweta nso aham ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ na onyinye-inata-iru-ọma di ọcha: n'ihi na aham di uku n'etiti mba nile, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

12. Ma unu onwe-unu nēme ka ọ ghara idi nsọ, n'isi, Table nke Jehova, ihe emere ka ọ ghara idi nsọ ka ọ bu, nkpuru-ya, bú ihe-oriri-Ya, bu kwa ihe-nlelì.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Malakai 1