Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Maika 7:3-6 Bible Nso (IGBOB)

3. Ọ bu n'elu ihe ọjọ ka ọbu-aka-ha abua di ime ya nke-ọma; onye-isi nāriọ, onye-ikpe ewe jikere n'ihi ugwọ; onye uku kwa, onye nēkwu ihe-ila-n'iyì nke nkpuru-obi-ya ka ọ bu: ha we tukọta ya dika udọ̀.

4. Onye nke ha nke kachasi nma di ka uke: onye ziri ezi jọrọ njọ kari ogige ogwu: ubọchi ndi-nche-gi, bú nleta-gi, abiawo; ub͕u a ka mb͕e ib͕a ha ghari gādi.

5. Unu ekwerela n'eyì, unu atukwasila eyì unu mara nke-ọma obi: debe eb͕ub͕ere-ọnu-gi ghara igwa nwanyi nēdina n'obi-gi okwu.

6. N'ihi na nwa-nwoke nākpọ nna-ya onye-nzuzu, nwa-nwanyi nēbili imegide nne-ya, nwunye nwa imegide nne di-ya; ndi-iro madu bu ndi ulo-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Maika 7