Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Maika 7:14-20 Bible Nso (IGBOB)

14. Were nkpa-n'aka-Gi zùa ndi-Gi, bú ìgwè ewu na aturu nke ihe-nketa-Gi, ndi bi iche, n'oké ọhia n'etiti Kamel: ka ha ta nri nime Beshan na Gilead, dika n'ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga.

15. Dika n'ubọchi i siri n'ala Ijipt puta, otú a ka M'gēme ka ọ hu oké ọlu di iche iche.

16. Mba di iche iche gāhu ya, ihere idi-ike-ha ewe me ha: ha gātukwasi aka n'ọnu, nti-ha gēchi.

17. Ha gāracha ájá dika agwọ; dika ihe di iche iche nke nākpu akpu nke ala, otú a ka ha gēwere ima-jijiji si n'ebe-nmechibido nile ha puta: Jehova, bú Chineke-ayi, ka ha gābiakute n'oké egwu, ha gātu kwa egwu gi.

18. Ònye bu Chineke dika Gi, Nke nēbupu ajọ omume, nāgabiga kwa njehie nke diri ndi ala-nketa-Ya fọduru? O jigideghi iwe-Ya rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na onye ebere nātọ utọ ka Ọ bu.

19. Ọ gēchighari, nwe obi-ebere n'aru ayi; Ọ gāzọda ajọ omume nile ayi: I gātubà kwa nmehie nile ha n'ebe dikarisiri omimi nke oké osimiri.

20. I gēnye Jekob ezi-okwu, me-kwa-ra Abraham ebere, bú nke I ṅuworo nna-ayi-hà n'iyi site n'ubọchi nile nke mb͕e ochie.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Maika 7