Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Maika 7:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Ahuhu dirim! n'ihi na Adiwom ka mb͕e ha ghọkọtaworo nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru, dika ntutukọ nkpuru ubi-vine fọduru nke ọghughọ-nkpuru-vine: ọ dighi otù uyọkọ nkpuru-vine fọduru iri; nkpuru-osisi fig nke buru uzọ cha ka nkpuru-obim chọsiworo ike.

2. Onye-ebere alawo n'iyì pua n'uwa, ọ dighi kwa onye ziri ezi n'etiti madu: ha nile nēche anwu ọbara; ha ji ub͕u achu ntá, onye ọ bula nwa-nne-ya.

3. Ọ bu n'elu ihe ọjọ ka ọbu-aka-ha abua di ime ya nke-ọma; onye-isi nāriọ, onye-ikpe ewe jikere n'ihi ugwọ; onye uku kwa, onye nēkwu ihe-ila-n'iyì nke nkpuru-obi-ya ka ọ bu: ha we tukọta ya dika udọ̀.

4. Onye nke ha nke kachasi nma di ka uke: onye ziri ezi jọrọ njọ kari ogige ogwu: ubọchi ndi-nche-gi, bú nleta-gi, abiawo; ub͕u a ka mb͕e ib͕a ha ghari gādi.

5. Unu ekwerela n'eyì, unu atukwasila eyì unu mara nke-ọma obi: debe eb͕ub͕ere-ọnu-gi ghara igwa nwanyi nēdina n'obi-gi okwu.

6. N'ihi na nwa-nwoke nākpọ nna-ya onye-nzuzu, nwa-nwanyi nēbili imegide nne-ya, nwunye nwa imegide nne di-ya; ndi-iro madu bu ndi ulo-ya.

7. Ma mu onwem, nime Jehova ka m'gēche nche nke-ọma; M'gēchere Chineke nke nzọputam: Chinekem gānu olum.

8. Aṅulam ọṅu, gi onye-irom: mb͕e m'dara ada, m'bilie; mb͕e m'nānọdu n'ọchichiri, Jehova gāburum ìhè.

9. Iwe di ọku nke Jehova ka m'gēbu, n'ihi na emehiewom megide Ya; rue mb͕e Ọ gēkpe ọnum, me ihe ekpere n'ikpem, Ọ gēme ka m'puta n'ìhè, m'gēlekwasi kwa ezi omume-Ya anya.

10. Nwanyi-irom gāhu kwa ya, ihere ewe kpuchie ya iru; bú onye nāsim, Òle ebe Jehova, bú Chineke-gi, nọ? Anyam abua gēlekwasi ya; ub͕u a ka ọ gāghọ ihe-nzọtọ dika apiti nke èzí.

11. Ubọchi ib͕a ogige-gi nile gādi! n'ubọchi ahu ka ókè-gi gādi n'ebe di anya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Maika 7