Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Maika 5:9-14 Bible Nso (IGBOB)

9. Ka aka-gi di elu imegide ndi nākpab͕u gi, ka ebipu kwa ndi-iro-gi nile.

10. Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na M'gēbipu inyinya-gi nile n'etiti gi, me ka ub͕ọ-ala-gi nile la n'iyì:

11. M'gēbipu kwa obodo nile nke ala-gi, kwatue ebe-gi nile ewusiri ike:

12. M'gēbipu kwa n'aka-gi mb͕asi nile; i gaghi-enwe kwa ndi ji igwe-oji atù isi ọma na isi ọjọ:

13. M'gēbipu kwa arusi-gi nile apiri api na ogidi-gi nile n'etiti gi; i gaghi-akpọ kwa isi ala nye ọlu aka-gi ọzọ.

14. M'gēropu kwa Asherim-i n'etiti gi: M'gēkpochapu kwa ndi-iro-gi nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Maika 5