Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Maika 5:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Ub͕u a ka i gēdo onwe-gi n'usu ndi nāpunara madu ihe, gi ada nke usu ndi nāpunara madu ihe: nnọchigide-n'agha ka ọ nọchigideworo ayi: ha gēji nkpa-n'aka tie onye-ikpe Israel na ǹtì.

2. Ma gi onwe-gi, Bet-lehem Efrata, nke di ntà idi n'etiti usu nile nke nnù abua na ọgu iri nke Juda, nime gi ka otù onye gēsi putaram ibu onye nāchi achi n'Israel; onye ọpupu-ya nile sitere na mb͕e ochie, site n'ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga.

3. N'ihi nka ka Ọ gārara ha nye, rue mb͕e nwanyi ime nēme gāmuwori nwa: umu-nne-ya ndi fọduru afọdu ewe laghachikute umu Israel.

4. Ọ gēguzo kwa, zùa ìgwè aturu-ya n'ike nke Jehova, na nbili-elu nke aha Jehova, bú Chineke-ya: ha gēbiri kwa; n'ihi na ub͕u a ka ọ gādi uku rue nsọtu nile nke uwa.

5. Onye a gābu kwa udo: mb͕e Asiria gābata n'ala-ayi, mb͕e ọ gāzọ kwa ukwu n'ulo-elu nile ayi, ayi gēme kwa ka ndi-ọzùzù-aturu asa na ndi-isi madu asatọ bilie imegide ya.

6. Ha gēji kwa mma-agha b͕uchapu ala Asiria na ala Nimrod n'ọnu-uzọ-ya nile: ọ gānaputa kwa ayi n'aka Asiria, mb͕e ọ gābata n'ala-ayi, mb͕e ọ gāzọ kwa ukwu n'ókè-ala-ayi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Maika 5