Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Maika 1:6-14 Bible Nso (IGBOB)

6. M'gēme kwa Sameria ka ọ ghọ obo-ihe nke ọhia, ka ọ ghọ kwa ebe akuru ubi-vine: M'gāwusi kwa nkume-ya nile nime ndagwurugwu, ọ bu kwa ntọ-ala-ya nile ka M'gēkpughe.

7. Ọ bu kwa arusi-ya nile apiri api ka agētipia, ọ bu kwa onyinye ikwa-iko ya nile ka agēsure n'ọku, ọ bu kwa arusi-ya nile ka M'gēme ebe tọb͕ọrọ n'efu: n'ihi na o siworo n'onyinye nwanyi nke nākwa iko chikọta ha, ọ bu kwa rue onyinye nwanyi nākwa iko ka ha gālaghachi.

8. N'ihi nka ka m'gēti aka n'obi, kwasie ákwá ike, jegharia buru onye yipuworo uwe b͕a ọtọ: m'gēme ikwa-ákwá dika nkita-ọhia, na iru-újú dika enyi-nnunu.

9. N'ihi na ihe nādighi ngwọta ka ntiputa-ọnyá nile bu: n'ihi na ọ biaruwo Juda; o rutewo ọnu-uzọ-ama ndim, rue Jerusalem.

10. Unu egosila ya na Gat, unu akwala ákwá ma-ọli: nime Bet-le-afra ka m'turuworo onwem n'ájá.

11. Gabigara onwe-unu, gi nwanyi bi na Shafia, n'ọtọ na ihere: nwanyi bi na Zeanan aputaghi; otiti-aka-n'obi nke Bet-izel gānapu unu ebe-nguzo-ya.

12. N'ihi na nwanyi bi na Marot echerewo inwe ezi ihe: n'ihi na ihe ọjọ esiwo n'ebe Jehova nọ ridarue ọnu-uzọ-ama Jerusalem.

13. Kegide ub͕ọ-ala n'inyinya ukwu ọsọ, gi nwanyi bi na Lekish: isi-nmalite nmehie ka ọ buru ada Zaion; n'ihi na ọ bu nime gi ka ahuru njehie nile nke Israel.

14. N'ihi nka ka i gēnye Moreshet-gat ihe-idu-ulo di iche iche: ulo nile nke Akzib gāghọrọ ndi-eze Israel miri-iyi nārafu arafu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Maika 1