Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Maika 1:4-12 Bible Nso (IGBOB)

4. Ugwu nile gāb͕aze kwa n'okpuru Ya, agāb͕awa kwa ndagwurugwu nile, dika wax n'iru ọku, dika miri nke anāwuda n'ebe-nrida.

5. N'ihi njehie Jekob ka ihe a nile di, na n'ihi nmehie nile nke ulo Israel. Gini bu njehie Jekob? ọ̀ bughi Sameria? gini bu kwa ebe di elu nile nke Juda? hà abughi Jerusalem?

6. M'gēme kwa Sameria ka ọ ghọ obo-ihe nke ọhia, ka ọ ghọ kwa ebe akuru ubi-vine: M'gāwusi kwa nkume-ya nile nime ndagwurugwu, ọ bu kwa ntọ-ala-ya nile ka M'gēkpughe.

7. Ọ bu kwa arusi-ya nile apiri api ka agētipia, ọ bu kwa onyinye ikwa-iko ya nile ka agēsure n'ọku, ọ bu kwa arusi-ya nile ka M'gēme ebe tọb͕ọrọ n'efu: n'ihi na o siworo n'onyinye nwanyi nke nākwa iko chikọta ha, ọ bu kwa rue onyinye nwanyi nākwa iko ka ha gālaghachi.

8. N'ihi nka ka m'gēti aka n'obi, kwasie ákwá ike, jegharia buru onye yipuworo uwe b͕a ọtọ: m'gēme ikwa-ákwá dika nkita-ọhia, na iru-újú dika enyi-nnunu.

9. N'ihi na ihe nādighi ngwọta ka ntiputa-ọnyá nile bu: n'ihi na ọ biaruwo Juda; o rutewo ọnu-uzọ-ama ndim, rue Jerusalem.

10. Unu egosila ya na Gat, unu akwala ákwá ma-ọli: nime Bet-le-afra ka m'turuworo onwem n'ájá.

11. Gabigara onwe-unu, gi nwanyi bi na Shafia, n'ọtọ na ihere: nwanyi bi na Zeanan aputaghi; otiti-aka-n'obi nke Bet-izel gānapu unu ebe-nguzo-ya.

12. N'ihi na nwanyi bi na Marot echerewo inwe ezi ihe: n'ihi na ihe ọjọ esiwo n'ebe Jehova nọ ridarue ọnu-uzọ-ama Jerusalem.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Maika 1