Umu Israel ka i gāgwa kwa okwu, si, Werenu nkpi ka ọ buru àjà-nmehie; na nwa-ehi na nwa-aturu, ha abua gāb͕a otù arọ, bú nke zuru okè, ka ha buru àjà-nsure-ọku;