Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 25:15-30 Bible Nso (IGBOB)

15. dika ọnu-ọgugu arọ si di site n'arọ jubile, otú a ka i gāzuru ihe n'aka madu-ibe-gi, dika ọnu-ọgugu arọ ihe-ọmume si di, otú a ka ọ gērenye gi.

16. Dika iba-uba nke arọ si di ka i gēme ka ọnu-ahia-ya ba uba, ọ bu kwa dika nbilata arọ si di ka i gēbilata ọnu-ahia-ya; n'ihi na ọnu-ọgugu ihe-ọmume ka ya onwe-ya nērenye gi.

17. Unu emerita-kwa-la onwe-unu ihe-ike; ma i gātu egwu Chineke-gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi.

18. Unu gēme kwa ukpurum nile, ikpém nile ka unu gēdebe kwa, me kwa ha; unu gēbi kwa n'ala ahu na ntukwasi-obi.

19. Ala ahu gāmi nkpuru-ya, unu gēriju afọ, biri nime ya na ntukwasi-obi.

20. Ma mb͕e unu gāsi, Gini ka ayi gēri n'arọ nke-asa? le, ayi agaghāgha nkpuru, ayi agaghi-achikọta kwa ihe-ọmume-ayi:

21. M'gēnye kwa ngọzim iwu idakwasi unu n'arọ nke-isi, ọ gēme-kwa-ra arọ atọ ahu ihe-ọmume.

22. Unu gāgha kwa nkpuru n'arọ nke-asatọ, rie ufọdu nime ihe-ọmume ahu, bú ihe ochie; rue arọ nke-iteghete, rue mb͕e ihe-ọmume-ya gābata, unu gēri ihe ochie.

23. Agaghi-ere ala ahu rue mb͕e ọ gādiru n'ihi na Mu nwe ala ahu: n'ihi na ndi-ọbìa na ndi-nnọdu ka unu bu n'alam.

24. N'ala nile nke ihe-onwunwe-unu unu gēnye kwa ihe-nb͕aputa bayere ala ahu.

25. Mb͕e nwa-nne-gi gāda ob͕eye, we re ufọdu nime ihe-onwunwe-ya, onye-nb͕aputa-ya nke bu onye-aru-ya gābia kwa, b͕aputa ihe nwa-nne-ya reworo.

26. Onye ọ bula, mb͕e ọ nēnweghi onye-nb͕aputa, ma aka-ya eruwo, ọ we huta ihe gēzu nb͕aputa-ya;

27. ya gu kwa arọ nile nke orire-ya, nyeghachi nwoke ọ renyere ya ihe fọduru; ọ gālaghachi kwa n'ihe-onwunwe-ya.

28. Ma mb͕e aka-ya achọtaghi ihe gēzu inweghachi ya n'onwe-ya, ihe ọ reworo gādi kwa n'aka onye zuworo ya rue arọ jubile: ma na jubile ahu ọ gāpu, ọ gālaghachi kwa n'ihe-onwunwe-ya.

29. Ọzọ, onye ọ bula, mb͕e ọ gēre ulo-obibi n'obodo nwere mb͕idi buruburu, nb͕aputa-ya gādi kwa rue mb͕e arọ orire-ya gēruzù; otù nb͕a-arọ ka nb͕aputa-ya gādi.

30. Ma ọ buru na ab͕aputaghi ya rue mb͕e ọ nwezuru arọ zuru okè, ulo ahu nke di nime obodo nwere mb͕idi buruburu gēguzosi-kwa-ra onye nāzú ya ike rue mb͕e ọ gādiru, rue ọb͕ọ-ya nile: ọ gaghi-apu na jubile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 25