Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 25:11-25 Bible Nso (IGBOB)

11. Jubile ka arọ nke-ọgu-abua-na-iri ahu gāburu unu: unu aghala nkpuru, unu ewe-kwa-la ihe-ubi nēpu n'onwe-ya nime ya, unu aghọrọ-kwa-la nkpuru nke osisi vine nile anākwachaghi akwacha.

12. N'ihi na jubile ka ọ bu; nsọ ka ọ gādiri unu: unu gēsite n'ubi rie ihe-ọmume-ya.

13. N'arọ jubile a ka unu gālaghachi, onye ọ bula n'ihe-onwunwe-ya.

14. Mb͕e i gērenye madu-ibe-gi ihe-orire, ma-ọbu zuru ihe n'aka madu-ibe-gi, unu emeritala onwe-unu ihe-ike:

15. dika ọnu-ọgugu arọ si di site n'arọ jubile, otú a ka i gāzuru ihe n'aka madu-ibe-gi, dika ọnu-ọgugu arọ ihe-ọmume si di, otú a ka ọ gērenye gi.

16. Dika iba-uba nke arọ si di ka i gēme ka ọnu-ahia-ya ba uba, ọ bu kwa dika nbilata arọ si di ka i gēbilata ọnu-ahia-ya; n'ihi na ọnu-ọgugu ihe-ọmume ka ya onwe-ya nērenye gi.

17. Unu emerita-kwa-la onwe-unu ihe-ike; ma i gātu egwu Chineke-gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi.

18. Unu gēme kwa ukpurum nile, ikpém nile ka unu gēdebe kwa, me kwa ha; unu gēbi kwa n'ala ahu na ntukwasi-obi.

19. Ala ahu gāmi nkpuru-ya, unu gēriju afọ, biri nime ya na ntukwasi-obi.

20. Ma mb͕e unu gāsi, Gini ka ayi gēri n'arọ nke-asa? le, ayi agaghāgha nkpuru, ayi agaghi-achikọta kwa ihe-ọmume-ayi:

21. M'gēnye kwa ngọzim iwu idakwasi unu n'arọ nke-isi, ọ gēme-kwa-ra arọ atọ ahu ihe-ọmume.

22. Unu gāgha kwa nkpuru n'arọ nke-asatọ, rie ufọdu nime ihe-ọmume ahu, bú ihe ochie; rue arọ nke-iteghete, rue mb͕e ihe-ọmume-ya gābata, unu gēri ihe ochie.

23. Agaghi-ere ala ahu rue mb͕e ọ gādiru n'ihi na Mu nwe ala ahu: n'ihi na ndi-ọbìa na ndi-nnọdu ka unu bu n'alam.

24. N'ala nile nke ihe-onwunwe-unu unu gēnye kwa ihe-nb͕aputa bayere ala ahu.

25. Mb͕e nwa-nne-gi gāda ob͕eye, we re ufọdu nime ihe-onwunwe-ya, onye-nb͕aputa-ya nke bu onye-aru-ya gābia kwa, b͕aputa ihe nwa-nne-ya reworo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 25