Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 25:1-15 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses okwu n'ugwu Sainai, si,

2. Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu gābà n'ala nke Mu onwem nēnye unu, ala ahu gēdebe-kwa-ra Jehova ubọchi-izu-ike.

3. Arọ isi ka i gāgha nkpuru n'ubi-gi, arọ isi ka i gākwacha osisi ubi-vine-gi, chikọta kwa ihe-ọmume-ya;

4. ma n'arọ nke-asa ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike gādiri ala ahu, bú ubọchi-izu-ike agēdebere Jehova: aghala nkpuru n'ubi-gi, akwacha-kwa-la osisi ubi-vine-gi.

5. Ewela ihe-ubi-gi nke nēpu n'onwe-ya, aghọrọ-kwa-la nkpuru nke osisi vine gi nke anākwachaghi akwacha: arọ nke idebe-ubọchi-izu-ike ka ọ gāburu ala ahu.

6. Ubọchi-izu-ike nke ala ahu gābu-kwa-ra unu ihe-oriri; ọ gāburu gi, buru kwa orù-gi nwoke, buru kwa orù-gi nwayi, buru kwa onye i goro ọlu, buru kwa onye nānọdu n'ulo-gi, bú ndi nọyere gi dika ọbìa;

7. anu-ulo-gi, na anu-ọhia nke di n'ala-gi, gēnwe kwa ihe-ọmume-ya nile n'ihe-oriri.

8. I gāgu-kwa-ra onwe-gi ubọchi-izu-ike asa, bú arọ, arọ asa ub͕ò asa; ubọchi nke ubọchi-izu-ike asa, bú arọ arọ, gābu-kwa-ra gi ọgu arọ abua na iteghete.

9. I gēme kwa ka opì-ike nke nādasi uda ike gābiga rue ebe nile n'ọnwa nke-asa, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu; n'ubọchi nkpuchi-nmehie ka unu gēme ka opì-ike gabiga n'ala-unu nile.

10. Unu gēdo kwa arọ nke-ọgu-abua-na-iri ahu nsọ, kpọsa kwa n'ala ahu nile si na ndi nile bi nime ya nwere onwe-ha: jubile ka arọ ahu gāburu unu; unu gālaghachi kwa, onye ọ bula n'ihe-onwunwe-ya, laghachi kwa, onye ọ bula n'ab͕uru-ya.

11. Jubile ka arọ nke-ọgu-abua-na-iri ahu gāburu unu: unu aghala nkpuru, unu ewe-kwa-la ihe-ubi nēpu n'onwe-ya nime ya, unu aghọrọ-kwa-la nkpuru nke osisi vine nile anākwachaghi akwacha.

12. N'ihi na jubile ka ọ bu; nsọ ka ọ gādiri unu: unu gēsite n'ubi rie ihe-ọmume-ya.

13. N'arọ jubile a ka unu gālaghachi, onye ọ bula n'ihe-onwunwe-ya.

14. Mb͕e i gērenye madu-ibe-gi ihe-orire, ma-ọbu zuru ihe n'aka madu-ibe-gi, unu emeritala onwe-unu ihe-ike:

15. dika ọnu-ọgugu arọ si di site n'arọ jubile, otú a ka i gāzuru ihe n'aka madu-ibe-gi, dika ọnu-ọgugu arọ ihe-ọmume si di, otú a ka ọ gērenye gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 25