20. nkpaji lara nkpaji, anya lara anya, ezé lara ezé: dika o meworo ka ọlu di n'aru madu, otú a ka agēme ka ọlu di n'aru ya.
21. Onye nētib͕u anu-ulo gākwughachi ya: ma onye nētib͕u madu, agēme ka ọ nwua.
22. Otù ikpé diri unu, dika anēkpe ọbìa, otú a ka agēkpe onye amuru n'ala: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.