Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 23:4-17 Bible Nso (IGBOB)

4. Ndia bu mb͕e akara àkà nke Jehova, bú nkpọkọta nsọ, nke unu gākpọsa na mb͕e-ha akara àkà.

5. N'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n'etiti ehihie na anyasi, ka ngabiga nke diri Jehova gādi.

6. N'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa ahu ka ememe achicha ekoghi-eko gādi-kwa-ra Jehova: ubọchi asa ka unu gēri achicha ekoghi-eko.

7. N'ubọchi mbu unu gēnwe nkpọkọta nsọ: ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.

8. Ma unu gēweta nso àjà-ọku anāchuru Jehova ubọchi asa: n'ubọchi nke-asa nkpọkọta nsọ gādi; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.

9. Jehova we gwa Moses okwu, si,

10. Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu bara n'ala nke Mu onwem nēnye unu, mb͕e unu gēwe kwa ihe-ubi-ya, unu gēweta-kwa-ra onye-nchu-àjà ùkwù nke ihe mbu nke owuwu-ihe-ubi-unu:

11. ọ gēfé kwa ùkwù ahu n'iru Jehova, ka unu we buru ihe nātọ utọ: n'echi nke ubọchi-izu-ike ahu ka onye-nchu-àjà gēfé ya.

12. N'ubọchi unu nēfé ùkwù ahu, unu gēme nwa-ebulu nke zuru okè nke b͕ara otù arọ ka ọ buru àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova.

13. Onyinye-inata-iru-ọma-ya gābu uzọ abua n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour agwara manu, bú àjà-ọku anāchuru Jehova ibu ísì utọ: àjà-ihe-ọṅuṅu-ya gābu kwa manya-vine, otù uzọ n'uzọ anọ nke hin.

14. Unu eri-kwa-la achicha, ma-ọbu ọka aṅara aṅa, ma-ọbu ọka rara oko, rue otù ubọchi a, rue mb͕e unu wetara onyinye iji biaru nso nke Chineke-unu: ọ bu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile n'ebe-obibi-unu nile.

15. Unu gāgu-kwa-ra onwe-unu site n'echi nke ubọchi-izu-ike ahu, site n'ubọchi unu butere ùkwù nke àjà-ofufé; ubọchi-izu-ike asa zuru okè gādi:

16. rue echi nke ubọchi-izu-ike nke-asa ka unu gāgu ọgu ubọchi abua na iri, unu gēweta kwa nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma ọhu.

17. Unu gēsite n'ebe-obibi-unu weta ob͕e achicha abua nke àjà-ofufé, nke uzọ abua n'uzọ iri nke ephah: utu ọka flour ka ha gābu, ihe nēko achicha ka agēji si ha, iburu Jehova nkpuru mbu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 23