Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 23:29-38 Bible Nso (IGBOB)

29. N'ihi na madu ọ bula nke anewedaghi n'ala n'otù ubọchi ahu, agēbipu ya n'etiti umu-nna-ya.

30. Ma madu ọ bula nke nēje ozi ọ bula n'otù ubọchi ahu, M'gēme ka madu ahu si n'etiti ndi-ya la n'iyì.

31. Ọ dighi ozi ọ bula unu gēje: ọ bu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile n'ebe-obibi-unu nile.

32. Ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike ka ọ gāburu unu, unu gēweda kwa nkpuru-obi-unu n'ala: n'ubọchi nke-iteghete nke ọnwa n'anyasi, site n'anyasi rue anyasi, ka unu gēdebe ubọchi-izu-ike-unu.

33. Jehova we gwa Moses okwu, si,

34. Gwa umu Israel okwu, si, N'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa nke-asa nka ka ememe ulo-ntu gādiri Jehova ubọchi asa.

35. N'ubọchi mbu nkpọkọta nsọ gādi: ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.

36. Ubọchi asa unu gēweta nso àjà-ọku ichuru Jehova: n'ubọchi nke-asatọ nkpọkọta nsọ gādiri unu; unu gēweta kwa nso àjà-ọku ichuru Jehova: ubọchi nb͕ochi ka ọ bu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.

37. Ndia bu mb͕e akara àkà nke Jehova, nke unu gākpọsa, ka ha buru nkpọkọta nsọ, iweta nso àjà-ọku anāchuru Jehova, bú àjà-nsure-ọku, na onyinye-inata-iru-ọma, àjà-ihe-ọṅuṅu, ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya:

38. nāgughi ubọchi-izu-ike nile nke Jehova, nāgughi kwa onyinye nile unu, nāgughi kwa nkwa-unu nile, nāgughi kwa onyinye-afọ-ofufo-unu nile, nke unu nēnye Jehova.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 23