Otú ọ di, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa nke-asa nka ka ubọchi nkpuchi-nmehie gādi: nkpọkọta nsọ ka ọ gāburu unu, unu gēweda kwa nkpuru-obi-unu n'ala; unu gēweta kwa nso àjà-ọku ichuru Jehova.