Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 23:2-9 Bible Nso (IGBOB)

2. Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e nile akara àkà nke Jehova, nke unu gākpọsa ha, ka ha buru nkpọkọta nsọ, ndia bu mb͕em akara àkà.

3. Ubọchi isi ka agēje ozi: ma n'ubọchi nke-asa, ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike gādi, bú nkpọkọta nsọ: ọ dighi ozi ọ bula unu gēje: ubọchi-izu-ike nke Jehova nwere ka ọ bu n'ebe-obibi-unu nile.

4. Ndia bu mb͕e akara àkà nke Jehova, bú nkpọkọta nsọ, nke unu gākpọsa na mb͕e-ha akara àkà.

5. N'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n'etiti ehihie na anyasi, ka ngabiga nke diri Jehova gādi.

6. N'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa ahu ka ememe achicha ekoghi-eko gādi-kwa-ra Jehova: ubọchi asa ka unu gēri achicha ekoghi-eko.

7. N'ubọchi mbu unu gēnwe nkpọkọta nsọ: ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.

8. Ma unu gēweta nso àjà-ọku anāchuru Jehova ubọchi asa: n'ubọchi nke-asa nkpọkọta nsọ gādi; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.

9. Jehova we gwa Moses okwu, si,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 23