Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 22:24-32 Bible Nso (IGBOB)

24. Ihe nke nkpuru-amu-ya chipiara echipia, ma-ọbu nke piara apia, ma-ọbu nke adọwapuru adọwapu, ma-ọbu nke ebipuru ebipu, unu ewetala ya nso Jehova: unu eme-kwa-la otú a n'ala-unu.

25. Unu esite-kwa-la n'aka onye ala ọzọ weta nso nri Chineke-unu site n'ihe ndia nile; n'ihi na nbibi-ha di nime ha, ọlu di n'aru ha: ha agaghi-abu ihe nātọ utọ n'ọnọdu unu.

26. Jehova we gwa Moses okwu, si,

27. Oke-ehi, ma-ọbu aturu, ma-ọbu ewu, mb͕e amuru ya, ọ gādi kwa n'okpuru nne-ya ubọchi asa; ma site n'ubọchi nke-asatọ we gaba ọ gābu ihe nātọ utọ ibu onyinye iji biaru nso nke àjà-ọku anāchuru Jehova.

28. Ehi ma-ọbu aturu, unu eb͕ula ya na nwa-ya n'otù ubọchi.

29. Ma mb͕e unu gāchuru Jehova àjà-ekele, unu gāchu ya ka unu we buru ihe nātọ utọ.

30. N'otù ubọchi ahu ka agēri ya; unu emela ka ihe fọdu nime ya rue ututu: Mu onwem bu Jehova.

31. Unu gēdebe kwa ihe nile M'nyere n'iwu, unu gēme kwa ha: Mu onwem bu Jehova.

32. Unu eme-kwa-la ka aha nsọm ghara idi nsọ; ma agēdom nsọ n'etiti umu Israel: Mu onwem bu Jehova nēdo unu nsọ,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 22