Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 22:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses okwu, si,

2. Gwa Eron na umu-ya ndikom okwu, ka ha kewapu onwe-ha n'ihe nsọ nile nke umu Israel, nke ndi ahu nēdorom nsọ, ka ha ghara kwa ime ka aha nsọm ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova.

3. Si ha, Nwoke ọ bula nke nkpuru-unu nile rue ọb͕ọ-unu nile, nke nābiaru nso ihe nsọ nile, nke umu Israel nēdoro Jehova nsọ, ma orurú-ya di n'aru ya, agēbipu madu ahu n'irum: Mu onwem bu Jehova.

4. Nwoke ọ bula nke nkpuru Eron nke bu onye-ekpenta, ma-ọbu nke nwere orùrù; ọ gaghi-eri ihe ọ bula nime ihe nsọ nile, rue mb͕e ọ di ọcha. Ọzọ, onye nēmetu ihe ọ bula ruru árú nke madu nwuru anwu aru, ma-ọbu nwoke nke ure-ya nēsi n'aru-ya pua;

5. ma-ọbu nwoke nke nēmetu ihe ọ bula nēnuputa enuputa aru, nke ruru árú n'ebe ọ nọ ma-ọbu nke nēmetu nwoke nke ruru árú n'ebe ọ nọ aru, ọbuná ọrurú-ya ọ bula;

6. madu nke nēmetu ya aru gāru árú rue anyasi, ọ gagheri kwa ihe ọ bula nime ihe nsọ nile, ma ọ buru na ọ saghi anu-aru-ya na miri.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 22