Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 21:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we si Moses, Gwa ndi-nchu-àjà, bú umu-ndikom Eron, okwu, si ha, Onye-nchu-àjà agaghi-emeru onwe-ya n'ihi madu nwuru anwu n'etiti umu-nna-ya;

2. ma-ọbughi nání n'ihi onye-aru-ya, nke di ya nso, n'ihi nne-ya, na n'ihi nna-ya, na n'ihi nwa-ya nwoke, na n'ihi nwa-ya nwayi, na n'ihi nwa-nne-ya nwoke:

3. na n'ihi nwa-nne-ya nwayi, bú nwa-ab͕oghọ nāmaghi nwoke, nke di ya nso, nke ọ dighi mb͕e nwoke luru ya na nwunye, n'ihi ya ka ọ gēmeru onwe-ya.

4. Ọ gaghi-emeru onwe-ya, ime onwe-ya ka ọ ghara idi nsọ, ebe ọ bu onye-nwe madu n'etiti umu-nna-ya.

5. Ha agaghi-eme onwe-ha isi-nkwọcha n'isi-ha, ha agaghi-akọpu kwa usọ afu-ọnu-ha, ha agaghi-eb͕u kwa eb͕ub͕u n'anu-aru-ha.

6. Ndi nsọ ka ha gāburu Chineke-ha, ha agaghi-eme kwa ka aha Chineke-ha ghara idi nsọ: n'ihi na àjà-ọku Jehova, bú nri Chineke-ha, ka ha onwe-ha nēweta nso: ha gādi kwa nsọ.

7. Ha agaghi-aluru nwayi nākwa iko na nwunye, ma-ọbu nwayi nke emeworo ka ọ ghara idi nsọ; ha agaghi-alu kwa nwayi achupuru achupu n'aru di-ya: n'ihi na nsọ ka ọ di n'ebe Chineke-ya nọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 21