Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 2:6-13 Bible Nso (IGBOB)

6. Nyawa ya na nnyawa-ya nile, wukwasi ya manu: onyinye-inata-iru-ọma ka ọ bu.

7. Ma ọ buru na onyinye-gi iji biaru nso bu onyinye-inata-iru-ọma eghere n'ihe ighe ihe, utu ọka flour etiyere manu ka agēji me ya.

8. I gēweta-kwa-ra Jehova onyinye-inata-iru-ọma nke eji ihe ndia me: agēweta kwa ya nso onye-nchu-àjà, ọ gēweta kwa ya n'ebe-ichu-àjà.

9. Onye-nchu-àjà gēsi kwa n'onyinye-inata-iru-ọma ahu bulie ihe-ncheta-ya, sure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: ọ bu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.

10. Ma nke fọduru site n'onyinye-inata-iru-ọma ahu Bu ihe Eron na umu-ya ndikom gēnwe: ọbu ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile sitere n'àjà-ọku nile anāchuru Jehova.

11. Ọ dighi onyinye-inata-iru-ọma ọ bula nke unu gēweta nso Jehova agēji ihe nēko achicha me: n'ihi na ọ dighi ihe ọ bula nke nēko achicha, ma-ọbu manu-aṅu ọ bula, unu gēji sure ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ buru àjà-ọku anāchuru Jehova.

12. Dika onyinye iji biaru nso, bú nkpuru mbu, ka unu gēweta ha nso Jehova: ma n'elu ebe-ichu-àjà ka ha nāgaghi-arigo, ibu ihe ísì utọ.

13. Onyinye ọ bula iji biaru nso nke onyinye-inata-iru-ọma-gi, i gēye kwa ya nnú; eme-kwa-la ka nnú nke ọgbugba-ndu Chineke-gi ghara idi n'onyinye-inata-iru-ọma-gi: n'onyinye-gi nile iji biaru nso ka i gēweta nnú nso.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 2