Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 2:13-16 Bible Nso (IGBOB)

13. Onyinye ọ bula iji biaru nso nke onyinye-inata-iru-ọma-gi, i gēye kwa ya nnú; eme-kwa-la ka nnú nke ọgbugba-ndu Chineke-gi ghara idi n'onyinye-inata-iru-ọma-gi: n'onyinye-gi nile iji biaru nso ka i gēweta nnú nso.

14. Ma ọ buru na i weta nso onyinye-inata-iru-ọma, bú nkpuru mbu, inye Jehova, ọka rara oko aṅara n'ọku, ọka nke ubi ọma esuru esu, ka i gēweta nso, ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma sitere na nkpuru mbu i.

15. I gētiye manu n'elu ya, tukwasi ya frankincense: onyinye-inata-iru-ọma ka ọ bu.

16. Onye-nchu-àjà gēsure ihe-ncheta-ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ, bú ufọdu nime ọka-ya esuru esu, na ufọdu nime manu-ya, tiyere frankincense-ya nile: ọ bu àjà-ọku anāchuru Jehova.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 2