Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 14:7-24 Bible Nso (IGBOB)

7. ọ gēfesa kwa ya ub͕ò asa n'aru onye-ahu anēme ka ọ di ọcha n'ekpenta, ọ gāsi kwa na ọ di ọcha, o gēzilaga kwa nnunu ahu di ndu nime ọhia sara iru.

8. Onye ahu anēme ka ọ di ọcha gāsu kwa uwe-ya nile, kọpu kwa aji-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gādi kwa ọcha: emesi kwa ọ gābata nime ọmuma-ulo-ikwū, ma ọ gānọdu n'ezí ulo-ikwū-ya ubọchi asa.

9. O gēru kwa n'ubọchi nke-asa, na ọ gākọpu aji-ya nile, bú agiri-isi-ya, na afu-ọnu-ya, na iku-anya-ya, ọbuná aji-ya nile ka ọ gākọpu: ọ gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa anu-aru-ya, ọ gādi kwa ọcha.

10. Ma n'ubọchi nke-asatọ ọ gēwere umu-ebulu abua zuru okè, na otù nwa-aturu zuru okè nke bu nne, nke b͕ara otù arọ, na uzọ atọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, na otù log nke manu.

11. Onye-nchu-àjà nke nēme ya ka ọ di ọcha gēguzo kwa nwoke ahu anēme ka ọ di ọcha, na ihe ahu di iche iche, n'iru Jehova, n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute ahu:

12. onye-nchu-àjà gēwere kwa otù nime umu-ebulu ahu, weta ya nso ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma, ya na log nke manu ahu, ọ gēfé kwa ha ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova:

13. o gēb͕u kwa nwa-ebulu ahu n'ebe o nēb͕u àjà-nmehie na àjà-nsure-ọku, n'ebe nke ebe nsọ ahu; n'ihi na, dika àjà-nmehie, àjà-ikpe-ọmuma bu ihe onye-nchu-àjà nwere: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu:

14. onye-nchu-àjà gēwere kwa ufọdu nime ọbara nke àjà-ikpe-ọmuma ahu, onye-nchu-àjà gētiye kwa ya n'ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye anēme ka ọ di ọcha, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka nri ya:

15. onye-nchu-àjà gēweta kwa ufọdu nime log nke manu ahu, wusi ya n'ọbu-aka-ekpe nke onye-nchu-àjà ahu:

16. onye-nchu-àjà gēdeye kwa nkpisi-aka-nri-ya nime manu nke di n'ọbu-aka-ekpe-ya, ọ gēwere kwa nkpisi-aka-ya fesa ufọdu nime manu ahu ub͕ò asa n'iru Jehova:

17. ufọdu nime manu nke fọduru n'ọbu-aka-ya ka onye-nchu-àjà gētiye kwa n'ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye ahu anēme ka ọ di ọcha, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya, n'elu ọbara àjà-ikpe-ọmuma:

18. ma manu nke fọduru n'ọbu-aka nke onye-nchu-àjà, o gētiye ya n'isi onye anēme ka ọ di ọcha: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n'iru Jehova.

19. Onye-nchu-àjà gēme kwa àjà-nmehie, kpuchiere ya nmehie-ya, bú onye anēme ka o si n'ọrurú-ya di ọcha; emesia o gēb͕u kwa àjà-nsure-ọku:

20. onye-nchu-àjà gēsure kwa àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma n'ebe-ichu-aja: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, ọ gādi kwa ọcha.

21. Ma ọ buru na ob͕eye ka ọ bu, nke aka-ya nērughi kwa ya, o gēwere kwa otù nwa-ebulu ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma ibu àjà-ofufè, ikpuchiri ya nmehie-ya, na otù uzọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara manu ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma, na otù log nke manu;

22. na nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, nke aka-ya ruru; otù gābu kwa àjà-nmehie, ibe-ya gābu àjà-nsure-ọku.

23. Ọ gēweta-kwa-ra ha onye-nchu-aja n'ubọchi nke-asatọ ime ka ọ di ọcha, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, n'iru Jehova.

24. Onye-nchu-aja gēwere kwa nwa-aturu ahu nke àjà-ikpe-ọmuma, na log manu ahu, onye-nchu-aja gēfé kwa ha ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 14