Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 14:27-35 Bible Nso (IGBOB)

27. onye-nchu-aja gēwere kwa nkpisi-aka-nri-ya fesa ufọdu nime manu nke di n'ọbu-aka-ekpe-ya ub͕ò asa n'iru Jehova:

28. onye-nchu-aja gētiye kwa ufọdu nime manu nke di n'ọbu-aka-ya n'ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye anēme ka ọ di ọcha, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya, n'elu ebe ọbara àjà-ikpe-ọmuma ahu:

29. ma nke fọduru nime manu nke di n'ọbu-aka onye-nchu-aja, o gētiye ya n'elu isi onye anēme ka ọ di ọcha, ikpuchiri ya nmehie-ya n'iru Jehova.

30. Ọ gāchu kwa otù nime nduru ahu n'àjà, ma-ọbu nime umu-kpalakwukwu ahu, nime ihe aka-ya ruru;

31. ọbuná ihe aka-ya ruru, otù ka ọ buru àjà-nmehie, ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku, n'elu onyinye-inata-iru-ọma: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, bú onye anēme ka ọ di ọcha n'iru Jehova.

32. Nka bu iwu nke onye ahu ihe-otiti ekpenta di n'aru ya, onye aka-ya nērughi n'ihe ime ya ka ọ di ọcha.

33. Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,

34. Mb͕e unu gābata n'ala Kenean, nke Mu onwem nēnye unu ka ọ buru ihe-onwunwe, M'we tiye ihe-otiti ekpenta n'ulo ọ bula nke ala ahu, bú ihe-onwunwe-unu;

35. onye nwe ulo ahu gābia kwa, gosi onye-nchu-àjà, si, Emewom ka m'hu ihe dika ihe-otiti n'ulo:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 14