Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 14:17-20 Bible Nso (IGBOB)

17. ufọdu nime manu nke fọduru n'ọbu-aka-ya ka onye-nchu-àjà gētiye kwa n'ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye ahu anēme ka ọ di ọcha, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya, n'elu ọbara àjà-ikpe-ọmuma:

18. ma manu nke fọduru n'ọbu-aka nke onye-nchu-àjà, o gētiye ya n'isi onye anēme ka ọ di ọcha: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n'iru Jehova.

19. Onye-nchu-àjà gēme kwa àjà-nmehie, kpuchiere ya nmehie-ya, bú onye anēme ka o si n'ọrurú-ya di ọcha; emesia o gēb͕u kwa àjà-nsure-ọku:

20. onye-nchu-àjà gēsure kwa àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma n'ebe-ichu-aja: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, ọ gādi kwa ọcha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 14