Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 11:34-43 Bible Nso (IGBOB)

34. Nime ihe-oriri nile nke anēri, nke ahu nke miri di otú a gābiakwasi gāru árú: ihe-ọṅuṅu nile nke anāṅu nime ihe ọ bula di otú a gāru kwa árú.

35. Ihe ọ bula nke ihe si n'ozu-ha gādakwasi gāru kwa árú; ma ọ bu ite-ọku, ma-ọbu ekwu, agākwatu ya: ihe ruru árú ka ha bu, ihe ruru árú ka ba gābu-kwa-ra unu.

36. Ma otú ọ di, isi-iyi ma-ọbu olùlù-miri, bú nchikọta miri, gādi ọcha: ma onye nēmetu ozu-ha aka gāru árú.

37. Ma mb͕e ihe nke si n'ozu-ha gādakwasi nkpuru-ọghigha ọ bula nke anāgha agha, ihe di ọcha ka ọ bu.

38. Ma mb͕e agētiye miri n'elu nkpuru-ọghigha, ma ihe si n'ozu-ha adakwasi ya, ihe ruru árú ka ọ buru unu.

39. Ọzọ, mb͕e otù nime anumanu, nke buru unu ihe-oriri, gānwu; onye nēmetu ozu-ya aka gāru árú rue anyasi.

40. Onye nēri ufọdu nime ozu-ya gāsu uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi: onye ahu nke nēbu ozu-ya gāsu kwa uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi.

41. Ọzọ ihe ọ bula nke nēnuputa enuputa nke nēnuputa n'elu uwa, ihe-árú ka ọ bu; agaghi-eri ya.

42. Ihe ọ bula nke nēje ije n'afọ-ya, na ihe ọ bula nke nēje ije n'ukwu anọ, ma-ọbu ihe ọ bula nwere ọtutu ukwu, ọbuná ihe nile nēnuputa enuputa nke nēnuputa n'elu uwa, unu erila ha; n'ihi na ihe ruru árú ka ha bu.

43. Unu ejila ihe-nnuputa ọ bula nke nēnuputa enuputa me onwe-unu ka unu buru ihe-árú, unu eji-kwa-la ha meru onwe-unu, ewe were ha meru unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 11