Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 9:9-20 Bible Nso (IGBOB)

9. Ha we si ya, Ala di anya nke-uku ka ndi-orù-gi si bia n'ihi aha Jehova, bú Chineke-gi: n'ihi na ayi anuwo akukọ- Ya, na ihe nile O mere n'Ijipt,

10. na ihe nile O mere eze abua nke ndi-Amorait, ndi biri n'ofè Jọdan, bú nke O mere Saihon, bú eze Heshbon, me kwa Og, bú eze Beshan, nke nọ n'Ashtarot.

11. Ndi-okenye-ayi na ndi nile bi n'ala-ayi we gwa ayi okwu, si, Werenu ihe unu gēri n'uzọ n'aka-unu, je izute ha, si ha, Ndi-orù-unu ka ayi bu: ma ub͕u a, ka ayi na unu b͕a ndu.

12. Achicha-ayi a, mb͕e ọ di ọku ka ayi weputara ya n'ulo-ayi ibu ihe ayi gēri n'uzọ n'ubọchi ayi putara ijekuru unu; ma ub͕u a, le, ọ kpọwo nku, ma kwa ebu:

13. karama-akpukpọ manya-vine ndia, nke ayi b͕ajuru, di kwa ọhu; ma, le, ha dọwara adọwa: uwe-ayi na akpukpọ-ukwu-ayi ndi a akawo kwa nká site n'ije di ogologo nke-uku.

14. Ndikom ahu we nara ufọdu nime ihe-oriri-uzọ-ha, ha ajughi kwa ase n'ọnu Jehova.

15. Joshua we me ka udo di n'etiti ha na Israel, ya na ha we b͕a ndu, ka ọ kwe ka ha di ndu: ndi-isi nzukọ Israel we ṅuara ha iyi.

16. O rue, n'ọgwugwu ubọchi atọ mb͕e ha na ha b͕asiri ndu, na ha nuru na ndi-ab͕ata-obi-ha ka ha bu, na ọ bu kwa n'etiti ha ka ndi ahu nēbi.

17. Umu Israel we bilie ije, biarue obodo nile ha n'ubọchi nke-atọ. Ma obodo-ha bu Gibeon, na Kefira, na Beirot, na Kiriat-jearim.

18. Ma umu Israel etib͕ughi ha, n'ihí na ndi-isi nzukọ Israel ewerewo Jehova, bú Chineke Israel, ṅuara ha iyi. Nzukọ ahu nile we tamu ntamu megide ndi-isi.

19. Ndi-isi nile we si nzukọ ahu nile, Ayi onwe-ayi ewerewo Jehova, bú Chineke Israel, ṅuara ha iyi: ma ub͕u a ayi apughi imetu ha aka.

20. Nka ka ayi gēme ha, kwe kwa ka ha di ndu; ka iwe we ghara idikwasi ayi, n'ihi iyi ahu nke ayi ṅuru ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 9