Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 5:5-11 Bible Nso (IGBOB)

5. N'ihi na ndi ebìri úgwù ka ha bu, bú ndi nile putara n'Ijipt: ma ndi nile amuru n'ọzara n'uzo mb͕e ha siri n'Ijipt puta, ha ebìghi ha úgwù.

6. N'ihi na ọgu arọ abua ka umu Israel jere ije n'ọzara, rue mb͕e mba ahu nile gwusiri, bú ndikom agha ahu ndi nēsi n'Ijipt puta, n'ihi na ha egeghi nti olu Jehova: ndi Jehova ṅuru iyi na Ọ gaghi-ekwe ka ha hu ala ahu nke Jehova ṅuru ndi bu nna-ha iyi na Ọ gēnye ayi, bú ala miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.

7. Ma umu-ha, ndi O mere ka ha bilie n'ọnọdu ha, ndi ahu ka Joshua biri úgwù: n'ihi na ndi anēbighi úgwù ka ha bu, n'ihi na ha ebìghi ha úgwù n'uzọ.

8. O rue, mb͕e ha bìzuru mba ahu nile úgwù, na ha nọduru n'ọnọdu-ha n'ọmuma-ulo-ikwū, rue mb͕e aru-ha di ike.

9. Jehova we si Joshua, Ta ka M'kpochapuworo ihe-ita-uta nke Ijipt n'aru unu. Ewe kpọ aha ebe ahu Gilgal, rue ta.

10. Umu Israel we ma ulo-ikwū-ha na Gilgal; ha we me ememe ngabiga n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n'anyasi, n'ala ihe nādighi nke Jeriko.

11. Ha we rie ufọdu nime ihe mìrì n'ala ahu n'echi nke ngabiga ahu, bú achicha ekoghi-eko na ọka aṅara n'ọku, n'otù ubọchi ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 5