5. M'we ziga Moses na Eron, tie Ijipt ihe, dika ihe ahu si di nke M'mere n'etiti ya: emesia M'we me ka unu puta.
6. M'we me ka nna-unu-hà si n'Ijipt puta: unu we biarue oké osimiri; ndi Ijipt we chiri ub͕ọ-ala na ndi-inyinya chua nna-unu-hà n'azu rue Oké Osimiri Uhie.
7. Ha we tikue Jehova, O we tiye oké ọchichiri n'etiti unu na ndi Ijipt, me ka oké osimiri biakwasi ha, O we kpuchie ha; anya-unu hu-kwa-ra ihe M'mere n'Ijipt: unu we biri n'ọzara ọtutu ubọchi.
8. M'we me ka unu ba n'ala ndi-Amorait, ndi bi n'ofè Jọdan; ha we buso unu agha: M'we nye ha n'aka-unu, unu we nweta ala-ha; M'we kpochapu ha n'iru unu.
9. Belak nwa Zipoa, bú eze Moab, we bilie buso Israel agha; o we ziga kpọ Belam nwa Beoa ikọcha unu:
10. ma ekweghm ige Belam nti; o we nāgọzi unu agọzi: M'we naputa unu n'aka-ya.
11. Unu we gabiga Jọdan, biarue Jeriko: ndi-nwe Jeriko we buso unu agha, bú ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Giagashait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus; M'we nye ha n'aka-unu.
12. M'we ziga ebu n'iru unu, nke chupuru ha n'iru unu, bú eze abua nke ndi-Amorait; ọ bughi na mma-agha-gi, ọ bughi kwa n'uta-gi.
13. M'we nye unu ala nke i nādọb͕ughi onwe-gi n'ọlu nime ya, na obodo nke unu nēwughi, unu we biri nime ha; ubi-vine na ubi-olive nke unu nākughi ka unu nēri nkpuru-ha.
14. Ma ub͕u a, nātunu egwu Jehova, nēfè-kwa-nu Ya òfùfè n'izu-okè na ezi-okwu: wezuga-kwa-nu chi nile nke nna-unu-hà fère òfùfè n'ofè Osimiri ahu, na n'Ijipt; ma fènu Jehova òfùfè.
15. Ma ọ buru na ọ jọ njọ n'anya-unu ifè Jehova òfùfè, rọputaranu onwe-unu ta onye unu gēfè òfùfè; ma ọ bu chi nile nke nna-unu-hà fère òfùfè nke di n'ofè Osimiri ahu, ma-ọbu chi nile nke ndi-Amorait, ndi unu onwe-unu bi n'ala-ha: ma mu onwem na ulom, ayi gēfè Jehova òfùfè.
16. Ndi Israel we za, si, Ya buru ayi ihe-árú irapu Jehova, ifè chi ọzọ òfùfè;
17. n'ihi na Jehova, bú Chineke-ayi, Ya onwe-ya bu onye mere ka ayi na nna-ayi-hà si n'ala Ijipt, si n'ulo ndi-orù, rigota, Onye me-kwa-ra ihe-iriba-ama uku ahu nile n'anya-ayi, debe ayi n'uzọ ahu nile nke ayi jere ije nime ya, na n'etiti ndi nile nke ayi gabigara n'etiti ha:
18. Jehova we chupu ndi ahu nile n'iru ayi, bú ndi-Amorait ndi bi n'ala nka: ayi onwe-ayi gēfè kwa Jehova òfùfè; n'ihi na Ya onwe-ya bu Chineke-ayi.