Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 24:5-13 Bible Nso (IGBOB)

5. M'we ziga Moses na Eron, tie Ijipt ihe, dika ihe ahu si di nke M'mere n'etiti ya: emesia M'we me ka unu puta.

6. M'we me ka nna-unu-hà si n'Ijipt puta: unu we biarue oké osimiri; ndi Ijipt we chiri ub͕ọ-ala na ndi-inyinya chua nna-unu-hà n'azu rue Oké Osimiri Uhie.

7. Ha we tikue Jehova, O we tiye oké ọchichiri n'etiti unu na ndi Ijipt, me ka oké osimiri biakwasi ha, O we kpuchie ha; anya-unu hu-kwa-ra ihe M'mere n'Ijipt: unu we biri n'ọzara ọtutu ubọchi.

8. M'we me ka unu ba n'ala ndi-Amorait, ndi bi n'ofè Jọdan; ha we buso unu agha: M'we nye ha n'aka-unu, unu we nweta ala-ha; M'we kpochapu ha n'iru unu.

9. Belak nwa Zipoa, bú eze Moab, we bilie buso Israel agha; o we ziga kpọ Belam nwa Beoa ikọcha unu:

10. ma ekweghm ige Belam nti; o we nāgọzi unu agọzi: M'we naputa unu n'aka-ya.

11. Unu we gabiga Jọdan, biarue Jeriko: ndi-nwe Jeriko we buso unu agha, bú ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Giagashait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus; M'we nye ha n'aka-unu.

12. M'we ziga ebu n'iru unu, nke chupuru ha n'iru unu, bú eze abua nke ndi-Amorait; ọ bughi na mma-agha-gi, ọ bughi kwa n'uta-gi.

13. M'we nye unu ala nke i nādọb͕ughi onwe-gi n'ọlu nime ya, na obodo nke unu nēwughi, unu we biri nime ha; ubi-vine na ubi-olive nke unu nākughi ka unu nēri nkpuru-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 24