Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 22:1-15 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e ahu Joshua kpọrọ ndi Reuben, kpọ kwa ndi Gad, kpọ kwa nkera ebo Manase,

2. si ha, Unu onwe-unu edebewo ihe nile nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'iwu, unu egewo kwa nti olum n'ihe nile m'nyere unu n'iwu:

3. unu arapughi umu-nne-unu ọtutu ubọchi ndia rue ta, ma unu edebewo ihe-ndebe nke ihe Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu.

4. Ma ub͕u a Jehova, bú Chineke-unu, emewo ka umu-nne-unu zuru ike, dika Ọ gwara ha okwu: ub͕u a kwa chigharianu, jerue ulo-ikwū-unu n'onwe-unu, rue ala ihe-onwunwe-unu, nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'ofè Jọdan.

5. Nání, lezienu anya nke-ọma ime ihe enyere n'iwu na iwu ahu, nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'iwu, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya, na ije íjè n'uzọ-Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n'iwu, na irapara n'aru Ya, na iwere obi-unu nile na nkpuru-obi-unu nile fè Ya òfùfè.

6. Joshua we gọzie ha, zilaga ha: ha we jerue ulo-ikwū-ha.

7. Ma nkera ebo Manase ka Moses nyere ihe-nketa nime Beshan: ma Joshua nyere nkera-ya ọzọ ihe-nketa n'etiti umu-nne-ha n'ofè Jọdan n'akuku Ọdida-anyanwu. Ọzọ kwa, mb͕e Joshua zilagara ha n'ulo-ikwū-ha, ọ gọzie ha,

8. gwa ha okwu, si, Werenu ọtutu àkù laghachi n'ulo-ikwū-unu, were kwa anu-ulo bara uba nke-uku, were kwa ọla-ọcha, were kwa ọla-edo, were kwa ọla, were ígwè, were kwa uwe bara uba nke-uku: soronu umu-nne-unu kere ihe-nkwata ndi-iro-unu.

9. Umu Reuben na umu Gad na nkera ebo Manase we laghachi, si n'ebe umu Israel nọ site na Shailo, nke di n'ala Kenean, ga, ijeru ala Gilead, iru ala ihe-onwunwe-ha, nke ha nwere ihe-onwunwe nime ya, dika okwu-ọnu Jehova n'aka Moses si di.

10. Ha we biarue buruburu-ala Jọdan, nke di n'ala Kenean, umu Reuben na umu Gad na nkera ebo Manase we wue ebe-ichu-àjà n'ebe ahu n'akuku Jọdan, bú ebe-ichu-àjà uku n'ile ya anya.

11. Umu Israel we nu, si, Le, umu Reuben na umu Gad na nkera ebo Manase ewuwo ebe-ichu-àjà na ncherita-iru ala Kenean, nime buruburu-ala Jọdan, n'ofè umu Israel nwe.

12. Mb͕e umu Israel nuru ya, nzukọ nile nke umu Israel we kpọkọta onwe-ha nime Shailo, irigokuru ha ibu agha.

13. Umu Israel we ziga Finehas nwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ijekuru umu Reuben, na ijekuru umu Gad, na ijekuru nkera ebo Manase, rue ala Gilead;

14. ya na ndi-isi iri, otù onye-isi otù onye-isi diri ulo nna ọ bula, inọrọ ebo nile nke Israel; ha nile n'otù n'otù, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha ka ha bu, ha diri usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Israel.

15. Ha we biakute umu Reuben, biakute kwa umu Gad, biakute kwa nkera ebo Manase, rue ala Gilead, ha we gwa ha okwu, si,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 22