29. na Jamut na ebe-ita-nri-ya nile, na En-ganim na ebe-ita-nri-ya nile, obodo anọ.
30. Site kwa n'ebo Asha, Mishal na ebe-ita-nri-ya nile, na Abdon na ebe-ita-nri-ya nile;
31. na Helkat na ebe-ita-nri-ya nile, na Rehob na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ.
32. Site kwa n'ebo Naftali, Kedesh nime Galili na ebe-ita-nri-ya nile, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Hamot-doa na ebe-ita-nri-ya nile, na Katan na ebe-ita-nri-ya nile; obodo atọ.
33. Obodo nile nke ndi Giashon, dika ab͕uru nile ha si di, di obodo iri na atọ na ebe-ita-nri-ha.
34. Ha nye-kwa-ra ab͕uru nile nke umu Merari, bú Livai fọduru, Jokneam na ebe-ita-nri-ya nile; na Kata na ebe-ita-nri ya nile,
35. na Dimna na ebe-ita-nri-ya nile, na Nahalal na ebe-ita-nri-ya nile, sitere n'ebo Zebulun; obodo anọ.
36. Site kwa n'ebo Reuben, Beza na ebe-ita-nri-ya nile, na Jehaz na ebe-ita-nri-ya nile,
37. na Kedimot na ebe-ita-nri-ya nile, na Mefaat na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ.
38. Site n'ebo Gad, Remot nime Gilead na ebe-ita-nri-ya nile, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Mahanaim na ebe-ita-nri-ya nile;
39. na Heshbon na ebe-ita-nri-ya nile, na Jeza na ebe-ita-nri-ya nile; obodo ahu nile di anọ.
40. Obodo ahu nile diri umu Merari dika ab͕uru nile ha si di, bú ndi fọduru site n'ab͕uru nile nke ndi Livai; ihe-ife-nzà-ha we di obodo iri na abua.
41. Obodo nile nke ndi Livai n'etiti ihe-onwunwe umu Israel di ọgu obodo abua na asatọ na ebe-ita-nri-ha.