Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 21:27-34 Bible Nso (IGBOB)

27. Ha nye-kwa-ra umu Giashon, ndi sitere n'ab͕uru ndi Livai, Golan nime Beshan na ebe-ita-nri-ya nile, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu; na Be-eshtera na ebe-ita-nri-ya nile, site na nkera ebo Manase; obodo abua.

28. Site kwa n'ebo Isaka, Kishion na ebe-ita-nri-ya nile, na Daberat na ebe-ita-nri-ya nile;

29. na Jamut na ebe-ita-nri-ya nile, na En-ganim na ebe-ita-nri-ya nile, obodo anọ.

30. Site kwa n'ebo Asha, Mishal na ebe-ita-nri-ya nile, na Abdon na ebe-ita-nri-ya nile;

31. na Helkat na ebe-ita-nri-ya nile, na Rehob na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ.

32. Site kwa n'ebo Naftali, Kedesh nime Galili na ebe-ita-nri-ya nile, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Hamot-doa na ebe-ita-nri-ya nile, na Katan na ebe-ita-nri-ya nile; obodo atọ.

33. Obodo nile nke ndi Giashon, dika ab͕uru nile ha si di, di obodo iri na atọ na ebe-ita-nri-ha.

34. Ha nye-kwa-ra ab͕uru nile nke umu Merari, bú Livai fọduru, Jokneam na ebe-ita-nri-ya nile; na Kata na ebe-ita-nri ya nile,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 21