40. Ọ bu ebo umu Dan dika ab͕uru nile ha si di ka ife-nzà nke-asa putara.
41. Ókè-ala ihe-nketa-ha we buru Zọra, na Eshtaol, na Ia-shemesh;
42. na Shaalabin na Ajalon, na Itla;
43. na Ilon, na Timna, na Ekron;
44. na Elteke, na Gibeton, na Bealat;
45. na Jihud, na Bene-berak, na Gat-rimon;
46. na Me-jakon, na Rakon, tiyere ókè-ala di na ncherita-iru Jafo.
47. Ókè-ala umu Dan we si n'ebe ha nọ pua: umu Dan we rigo, buso Leshem agha, were ya, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, ha we nweta ya, biri nime ya, we kpọ Leshem, Dan, dika aha Dan, bú nna-ha, si di.
48. Nka bu ihe-nketa ebo umu Dan dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha.
49. Ha we mesia ka eketa ala ahu dika ókè-ala-ya nile si di; umu Israel we nye Joshua nwa Nun ihe-nketa n'etiti ha:
50. n'okwu-ọnu Jehova ka ha nyere ya obodo ahu nke ọ riọrọ, bú Timnat-sera n'ugwu Efraim: o wue obodo ahu, biri nime ya.
51. Ndia bu ihe-nketa, nke Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na Joshua nwa Nun, na ndi-isi ulo ndi bu nna ebo umu Israel, mere ka eketa n'ife-nzà nime Shailo n'iru Jehova, n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute. Ha we kebìe ala ahu.