Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 19:40-51 Bible Nso (IGBOB)

40. Ọ bu ebo umu Dan dika ab͕uru nile ha si di ka ife-nzà nke-asa putara.

41. Ókè-ala ihe-nketa-ha we buru Zọra, na Eshtaol, na Ia-shemesh;

42. na Shaalabin na Ajalon, na Itla;

43. na Ilon, na Timna, na Ekron;

44. na Elteke, na Gibeton, na Bealat;

45. na Jihud, na Bene-berak, na Gat-rimon;

46. na Me-jakon, na Rakon, tiyere ókè-ala di na ncherita-iru Jafo.

47. Ókè-ala umu Dan we si n'ebe ha nọ pua: umu Dan we rigo, buso Leshem agha, were ya, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, ha we nweta ya, biri nime ya, we kpọ Leshem, Dan, dika aha Dan, bú nna-ha, si di.

48. Nka bu ihe-nketa ebo umu Dan dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha.

49. Ha we mesia ka eketa ala ahu dika ókè-ala-ya nile si di; umu Israel we nye Joshua nwa Nun ihe-nketa n'etiti ha:

50. n'okwu-ọnu Jehova ka ha nyere ya obodo ahu nke ọ riọrọ, bú Timnat-sera n'ugwu Efraim: o wue obodo ahu, biri nime ya.

51. Ndia bu ihe-nketa, nke Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na Joshua nwa Nun, na ndi-isi ulo ndi bu nna ebo umu Israel, mere ka eketa n'ife-nzà nime Shailo n'iru Jehova, n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute. Ha we kebìe ala ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 19