Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 19:18-31 Bible Nso (IGBOB)

18. Ókè-ala-ha we rue Jezreel, na Kesulot, na Shunem;

19. na Hafaraim, na Shion, na Anaharat;

20. na Rabit, na Kishion, na Ebez;

21. na Remet, na En-ganim, na En-hada, na Bet-pazez:

22. ókè-ala ahu we metu Teboa, na Shahazuma, na Bet-shemesh; ọpupu ókè-ala-ha di kwa na Jọdan: obodo iri na isi na obodo ntà ha.

23. Nka bu ihe-nketa ebo umu Isaka dika ab͕uru nile ha si di, obodo ahu na obodo ntà ha.

24. Ife-nzà nke-ise we putara ebo umu Asha dika ab͕uru nile ha si di.

25. Ókè-ala-ha we buru Helkat, na Hali, na Beten, na Akshaf;

26. na Alamelek, na Amad, na Mishal; ọ metu Kamel n'akuku Ọdida-anyanwu, metu kwa Shaihoa-libnat;

27. ọ we chigharia n'ọwuwa-anyanwu rue Bet-degon, we metu Zebulun, metu kwa ndagwurugwu Ifta-el n'akuku Ugwu rue Bet-emek na Neiel; ọ pua rue Kabul n'aka-ekpe,

28. na Ebron, na Rehob, na Hamon, na Kena, we rue Zaidon bara uba;

29. ókè-ala ahu we chigharia rue Rema, ru kwa obodo ahu ewusiri ike, bú Taia; ókè-ala ahu we chigharia rue Hosa; ọpupu-ya di kwa n'oké osimiri site na Hebel rue Akzib:

30. na Uma, na Efek, na Rehob: orú obodo na abua na obodo ntà ha.

31. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Asha dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 19