Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 19:12-20 Bible Nso (IGBOB)

12. o si na Sarid chigharia n'akuku Iru-anyanwu n'ọwuwa-anyanwu rue ókè-ala Kislot-teboa; ọ pua rue Daberat, we rigo rue Jafia;

13. o si n'ebe ahu gabiga n'akuku Iru-anyanwu n'akuku ọwuwa-anyanwu rue Gat-hefa, rue Et-kazin; ọ pua na Rimon, nke akpara rue Nea;

14. ókè-ala ahu we b͕a ya buruburu n'Ugwu rue Hanaton: ọpupu-ya di kwa na ndagwurugwu Ifta-el;

15. na Katat, na Nahalal, na Shimron, na Idala, na Bet-lehem: obodo iri na abua na obodo ntà ha.

16. Nka bu ihe-nketa umu Zebulun dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha.

17. Ife-nzà nke-anọ we putara Isaka, bú umu Isaka dika ab͕uru nile ha si di.

18. Ókè-ala-ha we rue Jezreel, na Kesulot, na Shunem;

19. na Hafaraim, na Shion, na Anaharat;

20. na Rabit, na Kishion, na Ebez;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 19