1. Ife-nzà nke-abua we putara Simeon, bú ebo umu Simeon dika ab͕uru nile ha si di: ihe-nketa-ha di n'etiti ihe-nketa umu Juda.
2. Ha we nwe n'ihe-nketa-ha Bia-sheba, ma-ọbu Sheba, na Molada;
3. na Haza-shual, na Bala, na Ezem;
4. na Eltolad, na Betul, na Họma;
5. na Ziklag, na Bet-makabot, na Haza-susa;
6. na Bet-lebaot, na Sharuhen; obodo iri na atọ na obodo ntà ha:
7. na Ain, na Rimon, na Eta, na Ashan; obodo anọ na obodo ntà ha:
8. na obodo ntà nile nke di obodo ndia buruburu rue Bealat-bia, bú Rema nke Negeb. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Simeon dika ab͕uru nile ha si di.
9. Site n'òkè umu Juda ka ihe-nketa umu Simeon di: n'ihi na òkè umu Juda riri nne kari ha: umu Simeon we keta ihe n'etiti ihe-nketa-ha.
10. Ife-nzà nke-atọ we putara umu Zebulun dika ab͕uru nile ha si di: ókè-ala ihe-nketa-ha we di rue Sarid:
11. ókè-ala-ha we rigo n'akuku Ọdida-anyanwu, ru kwa Marala, we metu Dabeshet, metu kwa miri-iyi nke di n'iru Jọkneam;
12. o si na Sarid chigharia n'akuku Iru-anyanwu n'ọwuwa-anyanwu rue ókè-ala Kislot-teboa; ọ pua rue Daberat, we rigo rue Jafia;