Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 17:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Ife-nzà nke mara ebo Manase di kwa: n'ihi na ya onwe-ya bu ọkpara Josef. Ọ diri Makia ọkpara Manase, bú nna Gilead, n'ihi na onye ahu bu onye-agha, o we nwe Gilead na Beshan.

2. Ife-nzà di kwa nke mara umu Manase fọduru dika ab͕uru nile ha si di; ọ diri umu Abieza, di-kwa-ra umu Hilek, di-kwa-ra umu Asriel, di-kwa-ra umu Shekem, di-kwa-ra umu Hifa, di-kwa-ra umu Shemida: ndia bu umu-ndikom Manase nwa Josef dika ab͕uru nile ha si di.

3. Ma Zelọfehad, nwa Hifa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase, enweghi umu-ndikom, ma ọ nwere umu-ndinyom: ndia bu kwa aha umu-ya ndinyom, Mahla, na Noa, na Họgla, na Milka, na Tiaza.

4. Ha we biarue nso n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na n'iru Joshua nwa Nun, na n'iru ndi-isi, si, Jehova nyere Moses iwu inye ayi ihe-nketa n'etiti umu-nne-ayi: o we nye ha ihe-nketa n'etiti umu-nne nna-ha dika okwu-ọnu Jehova si di.

5. Òkè iri we dabara Manase, nāgughi ala Gilead na Beshan, nke di n'ofè Jọdan;

6. n'ihi na umu-ndinyom Manase ketara ihe-nketa n'etiti umu-ya ndikom: ala Gilead kwa, umu-ndikom Manase fọduru nwere ya.

7. Ókè-ala Manase we si n'Asha rue Mikmetat, nke di n'iru Shekem; ókè-ala ahu we je rue aka-nri, rue ndi bi n'En-tapua.

8. Manase nwe ala Tapua: ma umu Efraim nwe Tapua rue ókè-ala Manase.

9. Ókè-ala ahu we rida rue miri-iyi Kena, n'akuku Ndida nke miri-iyi ahu: obodo ndia ka Efraim nwere n'etiti obodo Manase: ókè-ala Manase we di n'akuku Ugwu miri-iyi ahu, ọpupu-ya we di n'oké osimiri:

10. n'akuku Ndida ọ diri Efraim, ma n'akuku Ugwu ọ diri Manase, oké osimiri bu kwa ókè-ala-ya; ha we metu Asha n'Ugwu, metu kwa Isaka n'ọwuwa-anyanwu.

11. Manase nwekwara obodo n'Isaka na n'Asha, bú Bet-shean na umu-obodo-ya, na Ibleam na umu-obodo-ya, na ndi bi na Doa na umu-obodo-ya, na ndi bi na En-doa na umu-obodo-ya, na ndi bi na Teanak na umu-obodo-ya, na ndi bi na Megido na umu-obodo-ya, bú ebe di elu atọ ahu.

12. Ma umu Manase apughi inapu ndi bi n'obodo ahu ala-ha; ma ndi Kenean jisiri ike ibiri n'ala ahu.

13. O rue, mb͕e umu Israel di ike, na ha tiyere ndi Kenean n'ifè-òfùfè, ma ha anapusighi ha ala-ha.

14. Umu Josef we gwa Joshua okwu, si, Gini mere i nyeworom otù ihe-ife-nzà na otù òkè n'ihe-nketa; ma mu onwem bu ndi bara uba, n'ihi na Jehova agọziwom rue ub͕u a?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 17