Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 13:11-24 Bible Nso (IGBOB)

11. na Gilead, na ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat, na ugwu Heamon nile, na Beshan nile rue Saleka;

12. ala-eze nile nke Og nime Beshan, onye buri eze n'Ashtarot na n'Edrei (onye ahu fọduru site na ndi fọduru nke Refaim); Moses we tib͕ue ha, napu ha ala-ha.

13. Ma umu Israel anapughi ndi Geshua na ndi Meakat ala-ha: Geshua na Meakat we biri n'etiti umu Israel, rue ta.

14. Nání ebo Livai ka ọ nēnyeghi ihe-nketa; àjà-ọku nile nke Jehova, bú Chineke Israel, nke ahu bu ihe-nketa-ya, dika Ọ gwara ya okwu.

15. Moses we nye ebo umu Reuben dika ab͕uru nile ha si di.

16. Ókè-ala ha nwere we di site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na obodo nke di n'etiti ndagwurugwu ahu, na ala di lari nile nke di n'akuku Medeba;

17. Heshbon, na obodo-ya nile nke di n'ala di lari; Dibon, na Bamot-beal, na Bet-beal-meon;

18. na Jehaz, na Kedimot, na Mefaat;

19. na Kiriataim, na Sibma, na Zeret-shaha n'ugwu ndagwurugwu ahu;

20. na Bet-peoa, na nkpọrube nile nke Pisga, na Bet-jeshimot;

21. na obodo nile nke ala di lari, na ala-eze nile nke Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye buri eze nime Heshbon, onye Moses tib͕uru, ya na ndi-isi Midian, bú Evi, na Rekem, na Zua, na Hua, na Reba, ndi bu ndi-isi nke Saihon, ndi bi n'ala ahu.

22. Umu Israel were kwa mma-agha b͕ue Belam nwa Beoa, bu onye nāju ase, n'etiti ndi ha b͕uru.

23. Òkè-ala umu Reuben we buru Jọdan, na ókè-ala-ya. Nka bu ihe-nketa umu Reuben dika ab͕uru nile ha si di, obodo nile na obodo ntà nile ha.

24. Moses we nye ebo Gad, bú umu Gad, dika ab͕uru nile ha si di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 13