isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jona 4 Bible Nso (IGBOB)

1. O we jọ Jona ajọ njọ nke-uku, iwe-ya ewe di ọku.

2. O we kpere Jehova, si, Biko, Jehova, Ǹka abughi okwum, mb͕e m'nānọ n'alam? N'ihi nka ka m'buru uzọ b͕alaga na Tashish: n'ihi na amaram na Gi onwe-gi bu Chineke nke bu onye-amara, onye-obi-ebere, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ Nke nāba kwa uba n'ebere, Nke nēchèghari kwa uche bayere ihe ọjọ ahu I gēweta.

3. Ma ub͕u a, Jehova, biko, wepu ndum n'arum; n'ihi na ọ kam nma inwu ọnwu kari idi ndu.

4. Jehova we si, Ì nēme nke-ọma n'iwe iwe di ọku?

5. Jona we pua n'obodo, nọdu ala n'akuku Iru-anyanwu nke obodo, mere onwe-ya otù ulo-ntu n'ebe ahu, nọdu ala n'okpuru ya na ǹdò-ya, rue mb͕e ọ gāhu ihe gēme n'obodo.

6. Jehova, bú Chineke, we guputa otù ogili-ub͕a, me ka o tolite n'elu Jona, ka o we buru ǹdò n'elu isi-ya, inaputa ya n'ọnọdu ọjọ ya. Jona we ṅuria ọṅu nke-uku n'ihi ogili-ub͕a ahu.

7. Chineke we guputa otù ikpuru mb͕e chi bọrọ n'echi-ya, o we ribie ogili-ub͕a ahu, o we kpọnwua.

8. O rue, mb͕e anyanwu wara, na Chineke guputara otù ifufe Iru-anyanwu di ọku; anyanwu we tikwasi Jona n'isi, ike we gwusia ya, o we riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, Ọ kam nma inwu ọnwu kari idi ndu.

9. Chineke we si Jona, Ì nēme nke-ọma n'iwe iwe di ọku bayere ogili-ub͕a ahu? Ọ si, Anameme nke-ọma n'iwe iwe di ọku rue ọnwu.

10. Jehova we si, Gi onwe-gi mere ogili-ub͕a nka ebere, bú ihe nke i nādọb͕ughi onwe-gi n'ọlu n'ihi ya, nke i nēmeghi kwa ka ọ di uku; nke tolitere n'otù abali, la kwa n'iyì n'otù abali:

11. Mu onwem kwa, M'gaghi-emere Nineve ebere, bú obodo uku ahu; nke ihe kari orú nnù madu uzọ iri-na-ise nọ nime ya, bú ndi nāmaghi nke bu aka-nri-ha na aka-ekpe-ha; na ọtutu anumanu?