Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jona 3:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Jehova we rue Jona nti nke ub͕ò abua, si,

2. Bilie, jerue Nineve, bú obodo uku ahu, kpọsara ya nkpọsa ahu nke Mu onwem nāgwa gi.

3. Jona we bilie, jerue Nineve, dika okwu Jehova si di. Ma Nineve bu obodo di uku ri nne, ije nke ubọchi atọ.

4. Jona we malite ibà n'obodo ije nke otù ubọchi, o we kpọsa, si, Ọ fọduru ọgu ubọchi abua, ewe kwatue Nineve.

5. Ndi Nineve we kwere na Chineke; ha we kpọsa obubu-ọnu, yiri ákwà-nkpe, site n'onye uku ha we rue onye ntà ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jona 3