isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jona 2 Bible Nso (IGBOB)

1. Jona we si n'afọ azù ahu kpere Jehova, bú Chineke-ya, ekpere.

2. O we si,Esirim n'ahuhum kpọkue Jehova,O we zam;N'afọ ala-mọ ka m'siri tikue Ya,I nuru olum.

3. N'ihi na I tubàram nime miri di omimi, n'etiti oké osimiri nile,Osimiri dikwam buruburu;Ebili-miri-Gi nile na nmali-miri-Gi nile gabigara n'isim.

4. Mu onwem we si, Achupuwom n'iru anya-Gi abua;Otú ọ di, m'gēlegide kwa anya ọzọ n'ebe ulo uku Gi di nsọ di.

5. Miri b͕aram buruburu, rue nkpuru-obi;Ob͕u-miri dim buruburu;Achara-miri kukurum n'isi.

6. Rue ala ugwu nile ka m'ridara;Ala, ihe-ntuchi-ya nile kpachitaram rue mb͕e ebighi-ebi:Ma I mewo ka ndum si n'olùlù rigoputa, Jehova, bú Chinekem.

7. Mb͕e nkpuru-obim nēnweghi ike nimem, Jehova ka m'chetara:Ekperem we bakute Gi, ba n'ulo uku Gi di nsọ.

8. Ndi nāriba ihe-efu di iche iche nke nābughi ihe ama,Ebere-ha ka ha nārapu.

9. Ma mu onwem gēji olu ekele chuara Gi àjà;Ihe nke m'kweworo na nkwa ka m'gākwughachi.Nzọputa diri Jehova.

10. Jehova we gwa azù ahu okwu, o we b͕ọputa Jona n'ala-akọrọ.