Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joel 2:15-24 Bible Nso (IGBOB)

15. Fùanu opì-ike nime Zaion, donu obubu-ọnu nsọ, kpọsanu ubọchi nb͕ochi:

16. menu ka ndi Israel zukọta, donu nkpọkọta Israel nsọ, chikọtanu ndi-okenye, menu ka umu-ntakiri na ndi nāṅu ara zukọta: ka onye nālu nwunye ọhu si n'ime-ulo-ya puta, ka nwunye ọhu si kwa n'ulo-ndina-ya puta.

17. Ka ndi-nchu-àjà, bú ndi nējere Jehova ozi, kwa ákwá n'etiti uzọ-nbata-Ya na ebe-ichu-àjà-Ya, si, Jehova, mere ndi-Gi ebere, arara-kwa-la ihe-nketa-Gi nye n'ita-uta, Ka mba nile ọzọ we ghara ichi ha: n'ìhi gini ka ha gāsi n'etiti ndi nile dí iche iche, Òle ebe Chineke-ha nọ?

18. Jehova we kwo ekworo ala-Ya, nwe ọmiko n'aru ndi-Ya.

19. Jehova we za, si ndi-Ya, Le, M'ganēzitere unu ọka-unu na manya-vine ọhu unu na manu ọhu unu, afọ ya ewe ju unu: M'gaghi-eme kwa unu ihe-ita-uta ọzọ n'etiti mba nile:

20. ma M'gēme ka usu-ndi-agha Ugwu ahu si n'aru-unu je n'ebe di anya, M'gāchubà kwa ya n'ala kpọrọ nku na ebe tọb͕ọrọ n'efu, iru-ya n'oké osimiri Iru-anyanwu, na nsọtu-Ya n'oké osimiri Ọdida-anyanwu; ísì ọjọ ya gārigo kwa, e, ísì-ya nke jọb͕uru onwe-ya gārigo, n'ihi na o mewo onwe-Ya uku n'ime ihe.

21. Atula egwu, gi ala, te egwú ọṅù, ṅuri kwa; n'ihi na Jehova emewo Onwe-ya uku n'ime ihe.

22. Unu atula egwu, unu anu ọhia; n'ihi na ebe-ita-nri nile nke ọzara nēpuputa ahihia ndu, n'ihi na osisi nāmi nkpuru-ya, osisi fig na osisi vine nāmi nkpuru ka ike-ha ra.

23. Umu Zaion, teghari-kwa-nu egwú ọṅù, ṅuri kwa na Jehova, bú Chineke-unu: n'ihi na Ọ nēnye unu miri-ozuzo mbu ka ezi omume-Ya si di, me kwa ka oké miri-ozuzo zodatara unu, bú miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu, n'ọnwa mbu.

24. Ebe-nzọcha-ọka nile gējuputa kwa n'ọka wheat, ebe-inara-manya-vine na manu gērubiga kwa na manya-vine ọhu na manu ọhu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joel 2