Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joel 1:9-20 Bible Nso (IGBOB)

9. Ebipuwo onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu n'ulo Jehova; ndi-nchu-àjà, bú ndi nējere Jehova ozi, eruwo újú.

10. Emebiwo ubi, ala eruwo újú; n'ihi na emebiwo ọka, ihere emewo manya-vine ọhu, manu ọhu atalatawo.

11. Ka ihere me unu, ndi-ubi, kwasienu ákwá ike, unu ndi-ubi-vine, bayere ọka wheat, baye-kwa-ra ọka barley; n'ihi na owuwe-ihe-ubi alawo n'iyì.

12. Ihere emewo osisi vine, osisi fig atalatawo; osisi pomegranate, nkwu kwa, na osisi apple, osisi nile nke ọhia akpọnwuwo akpọnwu: n'ihi na ihere emewo obi-utọ, ọ pua n'aru umu madu.

13. Kenu ákwà-nkpe n'úkwù-unu, ti-kwa-nu aka n'obi, unu ndi-nchu-àjà; kwasienu ákwá ike, unu ndi-oje-ozi nke ebe-ichu-àjà; bianu, nọ ọnọdu-abali n'ákwà-nkpe, unu ndi nējere Chinekem ozi: n'ihi na eb͕ochiwo onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu n'ulo Chineke-unu.

14. Donu obubu-ọnu nsọ, Kpọnu ubọchi nb͕ochi, chikọtanu ndi-okenye na ndi nile bi n'ala n'ulo Jehova, bú Chineke-unu, tiku-kwa-nu Jehova.

15. Ewó, ubọchi ahu! n'ihi na ubọchi Jehova di nso, dika nbibi nke sitere n'aka Onye puru ime ihe nile ka ọ gābia.

16. Ọ̀ bughi na ncherita-iru anya-ayi ka ebipuworo ihe-oriri, e, ọṅù na otite-egwú-ọṅù n'ulo Chineke-ayi?

17. Nkpuru-ọghigha akpọnwuwo n'okpuru ọkpurukpu-ájá-ha; emewo ka ulo nile anēdebe ihe-oriri tọb͕ọrọ n'efu, akwatuwo ọba nile; n'ihi na ihere emewo ọka.

18. Le otú anu-ulo ezewo ume nke-uku! ọ nāb͕a ìgwè ehi nile ghari, n'ihi na ọ dighi nri-ọtita ha nwere; e, ìgwè ewu na aturu nile ahuwo ahuhu ikpe-ọmuma.

19. Ọ bu Gi, Jehova, ka m'nākpọku: n'ihi na ọku erichapuwo ebe-ita-nri nile nke ọzara, ire-ọku esuyewo kwa ọku n'osisi nile nke ọhia.

20. Ọzọ, agu Gi nāgu anu ọhia nile: n'ihi na ebe nile miri si erù atasiwo, ọku eripiawo kwa ebe-ita-nri nile nke ọzara.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joel 1